ọgbụgba ndụ'''

Ọgbụgba Ndụ

Nkọwa

dezie

Nkwekọrịta n'etiti ótù mmadụ na ibe ya, mmadụ abụọ maọbu karịa, ìgwè mmadụ na ìgwè mmadụ ibe ha maọbukwanu mba na mba, ime ótù ihe, maọbu ikwekọrịta òtù ha ga-esi na-emeso onwe ha omume, nke a na-agaghị emebi emebi, nke onye mebiri ya ga-enwe nsogbu na abụghị mmadụ ga-enye ya. Ndị na-eme nkwekọrịta à nwere ike ịracha ọbara akatara n'ahụ ha ma ọ bụ e jiri ọbara anụmanụ mee ya.

Gbaa ndụ (Ngwàà) nke pụtara: banye n'ọgbụgba ndụ; Gbara ndụ(ngwàà) nke pụtara: mere ọgbụgba ndụ


Nkèjiasụsụ

dezie

Mkpọàhà

Ọmụmaatụ

dezie
   Ngọzị na Chukwuemeka nwere ogbugba ndụ (gbara ndụ) na ha gụchaa akwụkwọ mahadum, na ha ga-alụ di na nwunye
   Ndị mbammiri na ndị eluala nwere ogbugba ndụ na o nweghị onye ga-egbu nwanne ya, ma n'ụlọ ma na mba.

Mkpọpụta

dezie

Olumba

dezie

Ntụgharị n'asụsụ ọzọ

dezie

Bekee

dezie

Covenant